Ihe anārọputa ka ezi aha bu kari ọtutu àkù, Amara di kwa nma kari ọla-ọcha na ọla-edo. Ọgaranya na ob͕eye ezutewo: Onye meworo ha nile bu Jehova. Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya: Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra. Ọkpukpu-ọlu nke obi ume-ala na egwu Jehova Bu àkù, na nsọpuru, na ndu. Ogwu na ib͕udu di n'uzọ onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi: Onye nēdebe nkpuru-obi-ya gānọ ha n'ebe di anya. Zulite nwata dika uzọ-ya si di, Ọbuná mb͕e o mere okenye ọ gaghi-esi nime ya wezuga onwe-ya. Ọgaranya nāchi ndi-ob͕eye, Ọzọ, orù ka onye nēbiri ego buru onye-nbinye. Onye nāgha ajọ omume dika nkpuru gēwe ajọ ihe dika ihe-ubi: Nkpa-n'aka nke nrubiga ókè nke iwe-ya gāgwusi kwa.
Gụọ ILU 22
Geere nke a ntị ILU 22
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 22:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị