Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 20:1-7

ILU 20:1-7 IGBOB

Onye nākwa emò ka manya-vine bu, onye-nkpọtu ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya bu; Onye ọ bula nke nāwaghari site na ya amaghi ihe. Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka oké ujọ anātu eze bu: Onye nākpasu Ya iwe nke nērubiga ókè nēmehie megide ndu nke aka ya. Ọ buru madu nsọpuru ikwusi ilu ọ̀gù: Ma onye ọ bula nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ganālusi ọ̀gù ike. N'ihi na ọ bu mb͕e oyi nātu, onye-ume-ngwu agaghi-alu ọlu ubi; Ọ gāriọ aririọ na mb͕e owuwe-ihe-ubi, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe. Miri nke miri emi ka ndum-ọdu n'obi madu bu; Ma onye-nghọta gādọputa ya. Ọtutu madu nākpọsa, onye ọ bula ebere nke aka ya: Ma onye kwesiri ntukwasi-obi, ònye gāchọputa ya? Onye ezi omume nke nējeghari n'izu-okè-ya, Ndi ihe nāgara nke-ọma ka umu-ya nke gānọchi ya gābu.