ILU 2:1-10
ILU 2:1-10 IGBOB
Nwam, ọ buru na i nara okwu-ọnum nile, Ọ buru kwa na i zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ; Itọrọ amam-ihe nti-gi n'ala, We wezuga obi-gi inwe nghọta; E, ọ buru na ọ bu nmata ka i nākpọku, Ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi; Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha, Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya: Mb͕e ahu ka i gāghọta egwu Jehova, Ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta. N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe; N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa: O nēzobere ndi ziri ezi nzube-ihe, Ọ bu ọta ndi nēje ije n'izu-okè nwere; Iche okporo-uzọ nile nke ikpé, Ọ bu kwa uzọ ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe. Mb͕e ahu ka i gāghọta ezi omume na ikpé, Na izi-ezi nile, e, ezi uzọ ọ bula. N'ihi na amam-ihe gābà n'obi-gi, Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ



