Logò Ngwá Baịbụl
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 14:29-33

ILU 14:29-33 IGBOB

Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nwere ọtutu nghọta: Ma onye nwere obi ọku nēbuli uche b͕agọrọ ab͕agọ. Ndu nke anu-aru ka obi agwọrọ ọria-ya bu: Ma ire-ure nke ọkpukpu nile ka ekworo bu. Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike nāta Onye kèworo ya uta: Ma onye nāsọpuru Ya ka onye nēme ob͕eye amara bu. Anenupu onye nēmebi iwu n'ihe ọjọ ya: Ma onye nwere ebe-nb͕abà n'ọnwu-ya ka onye ezi omume bu. N'obi onye-nghọta ka amam-ihe nānọgide: Ma n'etiti ndi-nzuzu ka ọ nēme ka amara ya.