ILU 13:13-25
ILU 13:13-25 IGBOB
Onye nēleda okwu Chineke anya nēmebi onwe-ya: Ma onye nātu egwu ihe enyere n'iwu, onye ahu ka agākwughachi ugwọ. Iwu onye mara ihe bu isi-iyi nke ndu, Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi. Ezi uche nēnye amara: Ma uzọ ndi-nghọb͕u bu nání nkume. Onye ọ bula nke nwere ezi uche ji ihe-ọmuma alu ọlu: Ma onye-nzuzu nāb͕asa uche b͕agọrọ ab͕agọ. Onye-ozi nke nēmebi iwu nādabà n'ihe ọjọ: Ma ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi bu ihe nāgwọ madu. Inọ-n'ob͕eye na nlelì gādiri onye nēzere idọ-aka-na-nti: Ma onye nāriba iba-nba ama ka agāsọpuru. Mb͕e ihe anāchọsi ike mere ọ nātọ nkpuru-obi utọ: Ma ọ bu ihe-árú n'anya ndi-nzuzu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha. Nējeso ndi mara ihe, i gāma kwa ihe: Ma eyì ndi-nzuzu ka agēmejọ. Ndi-nmehie ka ihe ọjọ nāchu: Ma ndi ezi omume ka agākwughachi ezi ihe. Ezi madu nēme ka umu umu-ya keta ihe-ya; Ma ihe anākpakọbara onye ezi omume ka àkù onye-nmehie bu. Ọtutu ihe-oriri di n'ubi ndi-ob͕eye: Ma o nwere nke anēkpochapu site n'ikpe nābughi ikpe. Onye nēb͕ochi nkpa-n'aka-ya nākpọ nwa-ya asì: Ma onye nāhu ya n'anya nādọsi ya aka na nti ike. Onye ezi omume nēri ihe rue mb͕e afọ juru nkpuru-obi-ya: Ma afọ ndi nēmebi iwu, ihe nākọ ya.

