Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 11:24-28

ILU 11:24-28 IGBOB

O nwere onye nāghasa aghasa, ma anọ̀ nātukwasiri ya ihe kari; O nwe-kwa-ra onye nēb͕ochi eb͕ochi kari nke ziri ezi, ma ọ nēdubà nání n'ikọ-ukọ. Nkpuru-obi nke nāgọzi agọzi ka agēme ka ọ ma abuba: Ọzọ, onye nēme ka ndi ọzọ ṅujue afọ, agēme kwa ka ya onwe-ya ṅujue afọ. Onye nēb͕uchi ọka, ọra madu gākọcha ya: Ma ngọzi n'isi onye nēre ya. Onye nāchọsi ezi ihe ike nāchọ ka ihe-ya nātọ Chineke utọ: Ma onye nāchọ ihe ọjọ, ihe ahu gābiakute ya. Onye nātukwasi obi n'àkù-ya, onye ahu gāda: Ma dika akwukwọ ndu ka ndi ezi omume gēpú.