Nāṅurinu ọṅu n'Onye-nwe-ayi mb͕e nile: m'gāsi ọzọ, Nāṅurinu ọṅu. Menu ka madu nile mara obi-ọma-unu. Onye-nwe-ayi nọ nso. Unu echeb͕ula onwe-unu n'ihe ọ bula; kama n'ihe nile ọ bula site n'ekpere na aririọ, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu nāriọ. Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi-unu na èchìchè-uche-unu nche nime Kraist Jisus. Nke fọduru, umu-nnam, ka ihe bu ezi-okwu ra, ka ha ra, bú ihe kwesiri nsọpuru, ka ha ra, bú ihe ziri ezi, ka ha ra, bú ihe di ọcha, ka ha ra, bú ihe kwesiri ihu-n'anya, ka ha ra, bú ihe ekwuru nke-ọma; ọ buru na idi-nma ọ bula di, o buru kwa na otuto ọ bula di, nāgukọnu ihe ndia. Ihe unu matara, nke unu nata-kwara, nke unu nu-kwa-ra, nke unu hu-kwa-ra n'arum, nēmenu ihe ndia: Chineke nke udo gānọyere kwa unu.
Gụọ NDI FILIPAI 4
Geere nke a ntị NDI FILIPAI 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI FILIPAI 4:4-9
7 days
What if there’s a better way to fight the endless worries that keep you up at night? Real rest is available—maybe closer than you think. Replace panic with peace through this 7-day Bible Plan from Life.Church, accompanying Pastor Craig Groeschel’s message series Anxious for Nothing.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị