NDI FILIPAI 3:8-11
NDI FILIPAI 3:8-11 IGBOB
E, tukwasi kwa, anamagu kwa ihe nile n'ihe-iyì n'ihi ọkika nke ọmuma Kraist Jisus, bú Onye-nwem: Onye m'yiri iyì ihe nile nkem n'ihi Ya, anamagu kwa ha n'ihe-nkpofu, ka m'we rita Kraist n'urù, ewe hum nime Ya, nēnweghi ezi omume ọ bula nke akam, bú nke sitere n'iwu, kama nēnwe ezi omume ahu nke okwukwe ekwere na Kraist nēweta, bú ezi omume ahu nke sitere na Chineke n'elu okwukwe: ka m'we mara Ya, na ike nke nbilite-n'ọnwu-Ya, na nnwekọ nke ahuhu-Ya nile, n'ihi na anēme ka mu na Ya nwekọ otù udi n'ọnwu-Ya; ọ buru na uzọ ọ bula di m'gēsi ru isi na ndi nwuru anwu bilite.

