Nwenu uche a nime onwe-unu, nke di kwa nime Kraist Jisus: Onye, ọ bu ezie na Ọ diri n'udi nke Chineke na mbu, ma Ọ gughi ya n'ihe O gējidesi ike, bú ira ka Chineke, kama O mere Onwe-ya ihe-efu, n'inara udi nke orù, ewe me Ya n'oyiyi nke madu; ebe ahuru Ya ka Ọ di ka madu n'oyiyi-Ya, O wedakwara Onwe-ya, we buru Onye nāṅa nti rue ọnwu, bú ọnwu nke obe. N'ihi nka Chineke welikwara Ya elu nke-uku, were kwa amara nye Ya aha ahu nke kariri aha nile ọ bula elu; ka ọ gābu n'aha Jisus ka ikperè nile we b͕ue n'ala, nke ihe nile di n'elu-igwe na ihe nile di n'elu uwa na ihe nile di n'okpuru ala, ka ire nile ọ bula we kwuputa kwa na Jisus Kraist bu Onye-nwe-ayi, ka ewe nye Chineke, bú Nna, otuto. Ya mere, ndi m'huru n'anya, dika unu ṅara nti mb͕e nile, ọ bughi nání mb͕e m'nọ n'etiti unu, kama ub͕u a mb͕e m'nānọghi, werenu egwu na ima-jijiji luputa kari nzọputa nke onwe-unu nke-uku; n'ihi na ọ bu Chineke Onye nālusi ọlu ike nime unu ichọ-achọ-unu na ilusi-ọlu-ike-unu, n'ihi na ọ di Ya ezi nma.
Gụọ NDI FILIPAI 2
Geere nke a ntị NDI FILIPAI 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI FILIPAI 2:5-13
5 Days
A new year equals a new beginning and a fresh start. It is a time to reset, refresh, and refocus on what's most important in your life. Having the best year ever starts by knowing you are made new through Jesus. Live new in the new year!
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị