NDI FILIPAI 2:19-23
NDI FILIPAI 2:19-23 IGBOB
Ma anamele anya nime Onye-nwe-ayi Jisus na m'gēzigara unu Timọti ọsọsọ, ka mu onwem we nwe kwa obi-utọ, mb͕e m'mara ọnọdu-unu. N'ihi na enweghi m onye ọ bula nke nkpuru-obi-ya yiri nke ya, bú onye gēcheb͕u onwe-ya bayere ọnọdu-unu n'ezie. N'ihi na ha nile nāchọ ihe nke aka ha, ọ bughi ihe nke Jisus Kraist, Ma unu mara ọnwunwa-ya, na, dika nwa nēso nna-ya, otú a ka o sorom buru orù n'izisa ozi ọma. Ya mere, onye a ka m'nēle anya na m'gēziga ya n'otù oge ahu, mb͕e ọ bula m'gāhu otú ọ gādirim

