Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa umu Israel okwu, si ha, Nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ọ gālu oké ọlu n'ikwe nkwa onye-Nazirait, ikewaputara Jehova onwe-ya: na manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ọ gēkewaputa onwe-ya; ọ gaghi-aṅu manya-vine b͕ara uka, ma-ọbu ihe- ọṅuṅu nābà n'anya b͕ara uka, ọ gaghi-aṅu kwa miri nkpuru-vine ọ bula, ọ gaghi-eri kwa nkpuru-vine ọhu ma-ọbu nke amikọrọ amikọ. Ubọchi nile nke nkewaputa-ya ọ dighi ihe nime ihe ọ bula emere site n'osisi vine nke manya-vine o gēri, site na nkpuru-ime-ya we rue mb͕ub͕ọ-ya. Ubọchi nile nke nkwa nkwaputa-ya ọ dighi aguba gāgabiga n'isi-ya: rue ozùzù ubọchi nile, nke ọ nēkewaputara Jehova onwe-ya nsọ ka ọ gādi, ọ gēme ka ntutu agiri-isi-ya to ogologo. Ubọchi nile ọ nēkewaputara Jehova onwe-ya ọ dighi madu nwuru anwu ọ gābiaru nso. Ọ gaghi-emeru onwe-ya bayere nna-ya, ma-ọbu bayere nne-ya, ma-ọbu bayere nwa-nne-ya nwoke, maọbu bayere nwa-nne-ya nwayi, mb͕e ha nwuru; n'ihi na nkewaputa Chineke-ya di n'isi-ya. Ubọchi nile nke nkewaputa-ya nsọ ka ọ diri Jehova.
Gụọ ỌNU-ỌGUGU 6
Geere nke a ntị ỌNU-ỌGUGU 6
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌNU-ỌGUGU 6:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị