ỌNU-ỌGUGU 35:33-34
ỌNU-ỌGUGU 35:33-34 IGBOB
Unu emeru-kwa-la ala ahu nke unu onwe-unu bi nime ya: n'ihi na ọbara, nke ahu nēmeru ala: ma ala, agaghi-ekpuchiri ya nmehie-ya bayere ọbara awusiri nime ya, ma-ọbughi nání n'ọbara nke onye wusiri ya. Eme-kwa-la ka ala ahu, nke unu onwe-unu nēbi nime ya, rua árú, nke Mu onwem nēbi n'etiti ya: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova, nēbi n'etiti umu Israel.

