Moses na Eron we si n'iru nkpọkọta ahu biarute ọnu-uzọ ulo-Ikwū nzute, da kpue-iru-ha n'ala: ewe me ka ha hu ebube Jehova anya. Jehova we gwa Moses okwu, si, Were nkpa-n'aka ahu, kpọkọta kwa nzukọ Israel, gi onwe-gi, na Eron, bú nwa-nne-gi, unu gwa nkume ahu di elu okwu n'anya-ha, ka ọ we nye miri-ya; i gēme kwa ka miri si na nkume ahu di elu putara ha: i gēme kwa ka nzukọ ahu na anu-ulo-ha ṅua miri. Moses we si n'iru Jehova were nkpa-n'aka ahu, dika O nyere ya iwu. Moses na Eron we kpọkọta nkpọkọta Israel rue iru nkume ahu di elu, ọ si ha, Biko, nurunu, ndi nenupu isi, àyi gēme ka miri si na nkume a di elu putara unu? Moses we welie aka-ya were nkpa-n'aka-ya tie nkume ahu di elu ub͕ò abua: miri riri nne we puta, nzukọ ahu we ṅua, ha na anu-ulo nile ha. Jehova we si Moses na Eron, N'ihi na unu ekweghi na Mu, idom nsọ n'anya umu Israel, n'ihi ya unu agaghi-eme ka nkpọkọta nka ba n'ala ahu nke M'nyeworo ha.
Gụọ ỌNU-ỌGUGU 20
Geere nke a ntị ỌNU-ỌGUGU 20
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌNU-ỌGUGU 20:6-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị