Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 18:8-32

ỌNU-ỌGUGU 18:8-32 IGBOB

Jehova we gwa Eron okwu, si, Ma Mu onwem, le, enyewom i ihe-ndebe nke àjà-nbulim nile, bú nke diri ihe nile edoro nsọ nke umu Israel, gi ka M'nyeworo ha ibu òkè otite-manu, nye kwa umu-gi ndikom, n'ukpuru ebighi-ebi. Nka gābu nke gi site n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, site n'ọku: onyinye-ha ọ bula iji biaru nso, ọbuná onyinye-inata-iru-ọma-ha ọ bula, na àjà-nmehie-ha ọ bula, na àjà-ikpe-ọmuma-ha ọ bula, nke ha gēnyeghachim, ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ gāburu gi, buru kwa umu-gi ndikom. N'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka i gēri ya: nwoke ọ bula gēri ya; ihe nsọ ka ọ gāburu gi. Nka bu kwa nke gi, àjà-nbuli nke onyinye-ha, ọbuná-àjà-ofufé nile nke umu Israel: gi ka M'nyeworo ha, nye kwa umu-gi ndikom, nye kwa umu-gi ndinyom, tiyere gi, n'ukpuru ebighi-ebi onye ọ bula nke di ọcha n'ulo-gi gēri ya. Manu nile nke kachasi nma nke manu ọhu, na manya nile nke kachasi nma nke manya-vine ọhu, na ọka, bú ihe mbu ha nke ha nēnye Jehova, gi ka M'nyeworo ha. Nkpuru mbu nke ihe nile di n'ala-ha, nke ha nēwetara Jehova, nke gi ka ọ bu; onye ọ bula nke di ọcha n'ulo-gi gēri ya. Ihe ọ bula ewezugara ka ebibie ya n'Israel, nke gi ka ọ bu. Nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa, nke anu-aru nile nke ha nēweta nso Jehova, n'etiti madu na n'etiti anu-ulo, ọ bu nke gi: nání i ghaghi ib͕aputa nwa madu buru uzọ mu, nwa anu-ulo ruru árú buru uzọ mu ka i gāb͕aputa kwa. Ma ndi-ha anāb͕aputa site na nke ruru otù ọnwa ka i gāb͕aputa, dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, n'ọla-ọcha shekel ise, dika shekel nke ebe nsọm si di (orú gerah ka ọ bu). Ma otú ọ di, nwa ehi buru uzọ mu, ma-ọbu nwa aturu buru uzọ mu, ma-ọbu nwa ewu buru uzọ mu, i gaghi-ab͕aputa ha; ihe nsọ ka ha bu: i gāwusa ọbara-ha n'ebe-ichu-àjàm, sure kwa abuba-ha ọku ibu ihe nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru àjà-ọku, ime ihe ísì utọ anēsurere Jehova. Anu-ha bu kwa nke gi, dika okpukpu-obi nke àjà-ofufé, na dika utaku-ukwu aka-nri, nke gi ka ọ bu. Àjà-nbuli nile nke ihe nsọ nile, nke umu Israel nēbuliri Jehova, ka M'nyeworo gi, nye kwa umu-gi ndikom, nye kwa umu-gi ndinyom, tiyere gi, n'ukpuru ebighi-ebi: ọb͕ub͕a-ndu nnú ebighi-ebi n'iru Jehova ka ọ buru gi, buru kwa nkpuru-gi tiyere gi. Jehova we si Eron, I gaghi-eketa ihe n'ala-ha, ọ dighi kwa òkè i gēnwe n'etiti ha: Mu onwem bu òkè-gi na ihe-nketa-gi n'etti umu Israel. Ma umu Livai, le, ha ka M'nyeworo otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nile n'Israel, ibu ihe-nketa, dika ihe-nkwughachi òfùfè-ha, nke ha onwe-ha nēfè, bú òfùfè nke ulo-ikwū nzute. Ma umu Israel agaghi-abiaru nso ulo-ikwū nzute ahu ọzọ ibū nmehie, inwu anwu. Ma ndi Livai gēfè òfùfè ahu nke ulo-ikwū nzute, ha onwe-ha gēbu kwa ajọ omume-ha: ukpuru ebighi-ebi ka ọ bu rue ọb͕ọ nile unu, ma n'etiti umu Israel ha agaghi-eketa ihe-nketa. N'ihi na ọ bu otù uzọ n'uzọ iri nke ihe umu Israel, nke ha nēbuliri Jehova dika àjà-nbuli, ka M'nyeworo ndi Livai, ibu ihe-nketa: ya mere M'siworo ha, N'etiti umu Israel ha agaghi-eketa ihe-nketa. Jehova we gwa Moses okwu, si, I gāgwa kwa ndi Livai okwu, si ha, Mb͕e unu nānara n'aka umu Israel otù uzọ n'uzọ iri nke M'nyeworo unu site n'aka-ha, dika ihe-nketa-unu, unu gēsi kwa na ya bulie àjà-nbuli nke Jehova, bú otù uzọ n'uzọ iri nke si n'otù uzọ n'uzọ iri ahu puta. Agāgu-kwa-ra unu àjà-nbuli-unu, dika ọka nke si n'ebe-nzọcha-ọka puta, na dika ojuju-manya-vine nke si n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine puta. Otú a ka unu gēbuli, ọbuná unu onwe-unu, àjà-nbuli nke Jehova sitere n'otù uzọ n'uzọ iri nke ihe unu nile, nke unu nānara n'aka umu Israel; unu gēsi kwa na ya nye Eron, bú onye-nchu-àjà, àjà-nbuli nke Jehova. Unu gēsi n'onyinye-unu nile bulie àjà-nbuli ọ bula nke Jehova, site n'ihe-ya nile kachasi nma, bú ihe nsọ ya sitere na ya. I gāsi kwa ha, Mb͕e unu nēsi na ya bulie ihe-ya kachasi nma, agāgu-kwa-ra ndi Livai ya dika ihe-ọmume nke ebe-nzọcha-ọka, na dika ihe-ọmume nke ebe-nzọcha-nkpuru-vine. Unu gēri kwa ya n'ebe ọ bula, unu onwe-unu na ulo nile unu: n'ihi na ugwọ-ọlu ka ọ buru unu, bú ihe-nkwughachi òfùfè-unu n'ulo-ikwū nzute. Unu agaghēbu kwa nmehie bayere ya, mb͕e unu si na ya bulie ihe-ya kachasi nma: unu agaghi-emeru kwa ihe nsọ nile nke umu Israel, unu agaghi-anwu kwa.