Moses na Eron we da kpue iru-ha n'ala n'iru nkpọkọta nile nke nzukọ umu Israel. Joshua nwa Nun na Keleb nwa Jefune, bú ndi sitere na ndi nēledo ala ahu, we dọwa uwe-ha: ha we gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si, Ala ahu nke ayi gabigaworo nime ya iledo ya, ala ahu di nma nke-uku nke-uku. Ọ buru na ihe ayi atọ Jehova utọ, Ọ gēme kwa ka ayi ba n'ala nka, Ọ gēnye kwa ayi ya; bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya. Nání, unu enupukwala isi n'aka Jehova, unu onwe-unu atu-kwa-la egwu ndi ala ahu; n'ihi na nri-ayi ka ha bu: ihe-nchegide-ha ewezugawo onwe-ya n'aru ha, ma Jehova nọyere ayi: unu atula egwu ha.
Gụọ ỌNU-ỌGUGU 14
Geere nke a ntị ỌNU-ỌGUGU 14
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌNU-ỌGUGU 14:5-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị