Igwe-oji ahu we si n'elu Ulo-ikwū ahu wezuga onwe-ya; ma, le, Miriam bu onye ekpenta, dika snow; Eron we che Miriam iru, ma, le, ọ bu onye-ekpenta. Eron we si Moses, Biko, onye-nwem, ariọm i, atukwasila ayi nmehie, nke ayi buru ndi-nzuzu nime ya, nke ayi mehiewo-kwa-ra nime ya. Biko, ka ọ ghara idi ka onye nwuru anwu, nke nkera anu-aru-ya richapuworo mb͕e o si n'àkpà-nwa nne-ya puta. Moses we tikue Jehova, si, Chineke, biko, me ka aru-ya di ike, biko. Jehova we si Moses, Ọ buru na nna-ya ab͕asa ya asọ n'iru ma-ọli, ìhere agaghi-eme ya ubọchi asa? ka emechibido ya uzọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa, emesia agāchikọta kwa ya na ndi Israel. Ewe mechibido Miriam uzọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa: ma ndi Israel ebulighi ije rue mb͕e achikọtara Miriam na ndi Israel.
Gụọ ỌNU-ỌGUGU 12
Geere nke a ntị ỌNU-ỌGUGU 12
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌNU-ỌGUGU 12:10-15
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị