O rue, mb͕e Sanbalat nuru na ayi onwe-ayi nālu mb͕idi, na iwe-ya di ọku, ewe kpasue ya iwe, o we chìa ndi-Ju ọchì. O kwue okwu n'iru umu-nne-ya na usu-ndi-agha Sameria, si, Gini ka ndi-Ju ndia ndi nāta aru nēme? hà gārapuru onwe-ha ihe? hà gāchu àjà? hà gēme ka ọlu-ha gwusia n'otù ubọchi? hà gēsi n'obo ájá me ka nkume di adi ọzọ, ebe nkume ahu nile bu ihe akpọworo ọku? Tobaia, bú onye Amon, nọ kwa n'akuku ya, ọ si, Ọzọ, mb͕idi nke ndi ahu nālu, ọ buru na nkita-ọhia arigo n'elu ya, o gētipú kwa mb͕idi-nkume-ha. Nuru, Chineke-ayi; n'ihi na ayi bu ndi eledaworo anya: Gi me kwa ka ita-uta-ha laghachi n'isi-ha, Gi rara kwa ha nye ibu ihe-nluta-n'agha n'ala ndọta-n'agha: ekpuchi-kwa-la ajọ omume-ha, ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie-ha n'iru Gi: n'ihi na ha akpasuwo Gi iwe n'iru ndi nālu mb͕idi.
Gụọ NEHEMAIA 4
Geere nke a ntị NEHEMAIA 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NEHEMAIA 4:1-5
7 Days
Have you ever been so tired or defeated in life that you’ve wanted to throw in the towel and give up? The Bible is full of encouragement to persevere and keep going! This 7-day reading plan will refresh you for the journey ahead.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị