Ma ndia bu ndi-nchu-aja na ndi Livai ndi soro Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua, rigota: Seraia, na Jeremaia, na Ezra; na Amaria, na Maluk, na Hatush; na Shekania, na Rehum, na Meremot; na Ido, na Ginetoi, na Abaija; na Mijamin, na Maadia, na Bilga; na Shemaia, na Joiarib, na Jedaia; na Salu, na Amok, na Hilkaia, na Jedaia. Ndia bu ndi-isi nke ndi-nchu-àjà na umu-nne-ha n'ubọchi Jeshua. Ndi Livai kwa: Jeshua, na Binui, na Kadmiel, na Sherebia, na Juda, na Matanaia, bú onye-isi usu ndi nēkele ekele, ya onwe-ya na umu-nne-ya. Bakbukia na Uno, bú umu-nne-ha, nọ kwa na ncherita-iru ha, dika ihe-ndebe nile ha si di. Jeshua we mua Joiakim, Joiakim mua Elaiashib, Elaiashib mua Joiada, Joiada, mua Jonatan, Jonatan mua Jadua.