Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAK 9:1-13

MAK 9:1-13 IGBOB

O we si ha, N'ezie asim unu, Na n'etiti ndi guzoro nso ufọdu di n'ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli, rue mb͕e ha gāhu ala-eze Chineke ka ọ biaworo n'ike. Mb͕e ubọchi isi gasiri Jisus chiri Pita na Jemes na Jọn tiyere Onwe-ya, O kuru ha rigo n'ugwu di elu we pua iche, nání ha: O we nwogha n'iru ha: uwe-Ya nile we nēnwupu, nācha oké ucha; dika onye ọ bula nke nēme ka ákwà di ocha n'uwa nāpughi ime ka ha di ọcha. Ewe me ka ha hu Elaija na Moses: ha na Jisus nēkwurita kwa okwu. Pita we za, si Jisus, Rabai, ọ di nma ka ayi nọ n'ebe a: ka ayi ma kwa ulo-ikwū atọ; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Elaija. N'ihi na ọ maghi ihe ọ gāza; n'ihi na ha nātu oké egwu. Igwe-oji we bia kpuchie ha: olu we si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya: nurunu okwu-Ya. Na mberede, mb͕e ha lere anya buruburu, ha ahughi onye ọ bula ọzọ, ma-ọbughi nání Jisus, Ya na ha. Mb͕e ha si n'ugwu ahu nārida, O we gwasie ha ike ka ha ghara ikọrọ onye ọ bula ihe ha hururi, ma-ọbughi mb͕e Nwa nke madu gēsiwori na ndi nwuru anwu bilie. Ha we jide okwu ahu, nājurita onwe-ha ihe isi-na-ndi-nwuru-nawu-bilie bu. Ha we jua Ya, si, Ndi-ode-akwukwọ si aṅa kwu na Elaija aghaghi ibu uzọ bia? O we si ha, Ọ bu ezie na Elaija bu uzọ bia, nēme kwa ka ihe nile di ka ha di na mbu: èsiwo kwa aṅa ede okwu a bayere Nwa nke madu n'akwukwọ nsọ, na Ọ gāhu ọtutu ahuhu, eme kwa Ya ihe-efu? Ma asim unu, na Elaija abiawo, ha me-kwa-ra ya ka ihe ha chọrọ ra, dika edeworo okwu bayere ya n'akwukwọ nsọ.