Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAK 8:22-38

MAK 8:22-38 IGBOB

Ha we bía na Betsaida. Ha we kutara Ya onye-ìsì, riọ Ya ka O metu ya aka. O we jide onye-ìsì ahu n'aka, duputa ya n'obodo ntà ahu; mb͕e Ọ busara ya ọnu-miri n'anya, bikwasi kwa ya aka-Ya abua, O we jua ya, si, Ọ̀ di ihe i huru? O we le anya n'elu, si, Ahurum madu; n'ihi na ahurum ha dika osisi, ha nējeghari. Mb͕e ahu O bikwasiri aka-Ya abua n'anya-ya ọzọ; o we legide anya, eme kwa ka anya-ya di ka ha di na mbu, o we hucha ihe nile. O we zilaga ya n'ulo-ya, si, Abàla ọbuná n'obodo ntà nke à. Jisus we pua, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, ba n'obodo ntà nile nke Sisaria Filipi: mb͕e ha nọ n'uzọ O we jua ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Onye ka madu nāsi na Mu onwem bu? Ha we gwa Ya, si, Jọn Baptist: ndi ọzọ si kwa, Elaija; ma ndi ọzọ si, Otù nime ndi-amuma. Ya onwe-ya we jua ha, si, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu? Pita we za, si Ya, Gi onwe-gi bu Kraist ahu. O we dọ ha aka na nti ka ha ghara igwa onye ọ bula okwu bayere Ya. O we malite izí ha, na Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, na ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, na aghaghi ib͕u Ya, na Ọ ghaghi kwa isi n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri. Ọ nēkwuwa kwa, okwu ahu. Pita we kuru Ya nye n'aru, malite ibara Ya nba. Ma mb͕e O chighariri, hu ndi neso uzọ-Ya, Ọ bara Pita nba si, Ga n'azum, Setan: n'ihi na i dighi-atukwasi uche-gi n'ihe Chineke, kama ọ bu n'ihe madu. O we kpọ ìgwè madu ahu, ha na ndi nēso uzọ-Ya, ka ha biakute Ya, Ọ si ha, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n'azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya, nēsokwam. N'ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọputa ndu-ya, ọ gētufu ya; ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n'ihim na n'ihi ozi ọma nkem, ọ gāzọputa ya. N'ihi na ùrù gini ka ọ bara madu, irita elu-uwa dum n'urù, ewe napu ya ndu-ya? N'ihi na ìhe-nb͕anwe gini ka madu gēji b͕anwe ndu-ya? N'ihi na onye ọ bula ihere Mu onwem na okwum nile gēme n'ọb͕ọ a nke nākwa iko, nke nēmehie kwa, ihere onye ahu gēme kwa Nwa nke madu, mb͕e Ọ gābia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi mọ-ozi-Ya di nsọ.