Ma Ọ siri ha, Aisaia buru amuma nke-ọma n'isi unu ndi-iru-abua, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha, Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ. Ma ha nēbirim isi ala n'efu, Nēzí ihe madu nyere n'iwu ka ha buru ozizí-ha. Unu nārapu ihe Chineke nyere n'iwu, jide kwa ozizí madu nyere n'aka-unu idebe. O we si ha, Unu nāju ihe Chineke nyere n'iwu nke-ọma, ka unu we debe ozizí nke enyere n'aka-unu idebe. N'ihi na Moses siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi; na, Onye kwujọrọ nna ma-ọbu nne, ya nwua ọnwu ahu: ma unu onwe-unu nāsi, Ọ buru na madu si nna-ya ma-ọbu nne-ya, Ihe ọ bula i gēritari n'akam bu Kọban, isi-ya bu, Ihe enyere Chineke; unu ekweghi ya ọzo ka o mere nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe ọ bula: nēme okwu Chineke ka ọ buru ihe-efu site n'ozizí enyere unu n'aka idebe, nke unu nyere madu n'aka idebe: ọtutu ihe di otú a ka unu nēme kwa.
Gụọ MAK 7
Geere nke a ntị MAK 7
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MAK 7:6-13
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị