Ngwa ngwa o we rugide ndi nēso uzọ-Ya ka ha ba n'ub͕ọ-ha, buru Ya uzọ gabiga n'ofè ọzọ na Betsaida, mb͕e Ya onwe-ya nēzilaga ìgwè madu ahu. Mb͕e O kelesiri ha, O jere n'ugwu ahu ikpe ekpere. Mb͕e o ruru anyasi, ub͕ọ ahu we di n'etiti oké osimiri, nání Ya onwe-ya nọ kwa n'ala. Mb͕e Ọ huru ha ka ha nādọb͕u onwe-ha n'ọnyinya-ub͕o-ha, n'ihi na ifufe nēfegide ha, O we biakute ha dika nche nke-anọ n'abali, nēje ije n'elu oké osimiri; O we chọ igabiga ha: ma mb͕e ha huru Ya ka Ọ nēje ije n'elu oké osimiri, ọ di ha ka Ọ bu mọ, ha we tisie nkpu ike: n'ihi na ha nile huru Ya, obi we lọ ha miri. Ma Ọ kpayere ha uka ngwa ngwa, si ha, Nwenu obi-ike: ọ bu Mu; unu atula egwu. O we rigokuru ha n'ub͕ọ; ifufe we febìe: ibobo we nwubiga ha ókè n'aru ri nne n'onwe-ha; n'ihi na ha aghọtaghi ọlu ebube nke ob͕e achicha ise, kama emereri ka obi-ha me etili.
Gụọ MAK 6
Geere nke a ntị MAK 6
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MAK 6:45-52
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị