Jisus we wezuga Onwe-ya, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, je oké osimiri: oké ọtutu madu si na Galili soro: oké ọtutu madu si kwa na Judia, si kwa na Jerusalem, si kwa n'Aidumia, na ofè Jọdan, na buruburu Taia na Saidon, biakute Ya, mb͕e ha nuru ihe nile Ọ nēme, ka ha ra. O we gwa ndi nēso uzọ-Ya okwu, ka otù ub͕o ntà di nēche Ya n'ihi ìgwè madu ahu, ka ha ghara ikpab͕u Ya: n'ihi na O mereri ka aru ọtutu madu di ike; ya mere na ha dagidere Ya ka ha metu Ya aka, ka ha ra, bú ndi ajọ ọria di iche iche di n'aru. Ọzọ, mb͕e ọbula ndi-mọ nādighi ọcha lere Ya anya, ha nāda n'ala n'iru Ya, nēti nkpu, si, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke. Ọ nābasi-kwa-ra ha nba ike, ka ha ghara ime ka Ọ puta ìhè.
Gụọ MAK 3
Geere nke a ntị MAK 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MAK 3:7-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị