Ma unu onwe-unu lezie anya n'onwe-unu: n'ihi na ha gārara unu nye n'aka nnọkọ-ikpé di iche iche; n'ulo-nzukọ di iche iche ka agāpia kwa unu ihe; n'iru ndi-isi na ndi-eze ka unu gēguzo kwa n'ihim, iburu ha àmà. Aghaghi kwa ibu uzọ kwusa ozi ọma nkem n'iru mba nile. Ma mb͕e ọ bula ha duru unu je ikpé, rara kwa unu nye, unu ebula uzọ nēcheb͕u onwe-unu okwu unu gēkwu: kama okwu ọ bula agēnye unu n'oge hour ahu, kwuenu nke ahu: n'ihi na ọ bughi unu onwe-unu nēkwu, kama ọ bu Mọ Nsọ. Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n'aka ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye; umu gēbili kwa imegide ndi muru ha, me kwa ka ha nwua ọnwu. Madu nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham: ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agazọputa.
Gụọ MAK 13
Geere nke a ntị MAK 13
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MAK 13:9-13
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị