Ndi-Sadusi, ndi si na nbilite-n'ọnwu adighi, we biakute Ya; ha we jua Ya, si, Onye-ozizí, Moses dere akwukwọ nye ayi, si, Ọ buru na nwa-nne-nwoke onye ọ bula anwua, rapu nwunye n'azu, ma ọ rapughi nwa, ka nwa-nne-ya nwoke kuru nwunye-ya, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya. Umu-nne-ndikom asa di: nke-mbu luru nwunye, we nwua nārapughi nkpuru; nke-abua we kuru ya, nwu kwa, ọ rapughi kwa nkpuru n'azu; nke-atọ otú ahu kwa: ndikom asa ahu arapughi nkpuru. N'ikpe-azu ha nile nwanyi ahu nwu-kwa-ra. Na nbilite-n'ọnwu, nwùnye onye n'etiti ha ka ọ gābu? n'ihi na ha asa nwere ya na nwunye. Jisus siri ha, Ọ̀ bughi n'ihi nka ka unu ji hie uzọ, na unu amataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ma-ọbu ike Chineke? N'ihi na mb͕e ha gēsi na ndi nwuru anwu bilie, ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n'ọlulu-di; kama ha di ka ndi-mọ-ozi di n'elu-igwe. Ma n'okwu bayere ndi nwuru anwu, na anēme ka ha si n'ọnwu bilie; ùnu agughi n'akwukwọ Moses, n'ebe edere okwu bayere Osisi ntà, otú Chineke gwara ya, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob? Ọ bughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu: unu onwe-unu nēhie uzọ nke-uku.