Mb͕e ha nāga n'ututu, ha we hu osisi fig ahu na ọ kpọnwururi site na nkpọrọgwu. Pita we cheta, si Ya, Rabai, le, osisi fig nke I buru ọnu akpọnwuwo. Jisus we za, si ha, Nwenu okwukwe Chineke. N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke gāsi ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri; nke nāgaghi-enwe obi abua, kama o kwere na ihe ọ nēkwu nēme; ọ gādiri ya. Ya mere M'ji si unu, Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nēkpe n'ekpere riọ kwa, kwenu na unu anatawo ha, ha gādiri unu. Ọzọ, mb͕e ọ bula unu guzoro nēkpe ekpere, b͕agharanu, ma o buru na unu nwere ihe ọ bula megide onye ọ bula; ka Nna-unu Nke bi n'elu-igwe we b͕aghara kwa unu ndahie nile unu. Ma ọ buru na unu onwe-unu ab͕agharaghi, Nna-unu Nke bi n'elu-igwe agaghi-ab͕aghara unu ndahie nile unu.
Ha we bia rue Jerusalem ọzọ: mb͕e Ọ nējeghari n'ulo uku Chineke, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye we biakute Ya; ha we si Ya, Ọ̀ bu n'aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ma-ọbu ònye nyere Gi ike a ka I we me ihe ndia? Ma Jisus siri ha, M'gāju unu otù okwu, unu zakwam, emesia M'gāgwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia. Baptism nke Jọn, ò sitere n'elu-igwe, ma-ọbu na ò sitere n'aka madu? zanum. Ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n'elu-igwe; Ọ gasi, N'ìhi gini kwa ka unu nējighi kwe ya? Ma àyi gāsi kwa, O sitere n'aka madu? ha nātu egwu ndi-Ju: n'ihi na madu nile guru Jọn na ọ bu onye-amuma n'ezie. Ha we za Jisus, si, Ayi amataghi. Jisus we si ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia.