Ha we ga ba na Kapanaum; ngwa ngwa O we ba n'ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike we nēzí ihe. Ibobo ozizí-Ya we nwua ha n'aru: n'ihi na Ọ nēzí ha ihe dika O nwere ike, ọ bughi kwa dika ndi-ode-akwukwọ. Ngwa ngwa nwoke nke di n'aka mọ nādighi ọcha we nọ n'ulo-nzukọ-ha; o we tisie nkpu ike, si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Jisus Onye Nazaret? Ì biara ila ayi n'iyì? Amataram gi Onye I bu, Onye Nsọ ahu nke Chineke. Jisus we bara ya nba, si, Kpuchie ọnu-gi, si kwa nime ya puta. Mọ ahu nādighi ọcha we se ya, were kwa oké olu kpọ nkpu, we si nime ya puta. Ibobo we nwua ha nile n'aru, nke mere ka ha jurita onwe-ha, si, Gini bu nka? ozizí ọhu! ọ bu n'ike ka Ọ nēnye ọbuná ndi-mọ nādighi ọcha iwu, ha nāṅa kwa Ya nti. Ngwa ngwa ewe kọsa akukọ-Ya ebe nile n'ala dum di Galili gburugburu.
Gụọ MAK 1
Geere nke a ntị MAK 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MAK 1:21-28
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị