Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAIKA 6:6-8

MAIKA 6:6-8 IGBOB

M'gēji gini bia n'iru Jehova, rube isi n'iru Chineke di elu? #m'gābia n'iru Ya chiri ihe àjà-nsure-ọku, chiri umu-ehi b͕ara otù arọ? Ọ̀ gātọ Jehova utọ, bú nnù kwuru nnù ebulu ma-ọbu orú nnù kwuru orú nnù iyi manu? #m'gēnye ọkparam n'ihi njehiem, nkpuru afọm n'ihi nmehie nkpuru-obim? Gi madu, O gosiwo gi ihe di nma; ọ̀ bu kwa gini ka Jehova nāchọ n'aka-gi, ma-ọbughi nání ime ihe ekpere n'ikpe, na ihu ebere n'anya, na iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ije?