Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 9:35-38

MATIU 9:35-38 IGBOB

Jisus we nējeghari n'obodo na obodo ntà ha nile, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche. Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu nile, O nwere ọmiko n'aru ha, n'ihi na anēsob͕u ha, nāchusa kwa ha, dika aturu nēnweghi onye nāzù ha. Mb͕e ahu Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Owuwe-ihe-ubi riri nne n'ezie, ma ndi-ọlu di ole-na-ole. Ya mere, nāriọnu Onye-nwe owuwe-ihe-ubi ahu, ka O zipu ndi-ọlu bà n'owuwe-ihe-ubi-Ya.