Ya mere onye ọ bula nke nānu okwum ndia, nēme kwa ha, agēji ya tuyere nwoke nwere uche, onye wuru ulo-ya n'elu oké nkume: miri we zo, osimiri ru kwa, ifufe fe kwa, we makwasi ulo ahu; ma ọ dagh: n'ihi na atọrọ ntọ-ala-ya n'elu oké nkume ahu. Ma onye ọ bula nke nānu okwum ndia, ma ọ dighi-eme ha, agēji ya tuyere nwoke nke bu onye-nzuzu, onye wuru ulo-ya n'elu ájá: miri we zo, osimiri ru kwa, ifufe fe kwa, we tikwasi ulo ahu; o we da: ọdida-ya di kwa uku. O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia, ibobo ozizí-Ya nwuru ìgwè madu nile n'aru: n'ihi na Ọ nēzí ha ihe dika O nwere ike ọ bughi kwa dika ndi-ode-akwukwọ-ha.
Gụọ MATIU 7
Geere nke a ntị MATIU 7
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 7:24-29
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị