MATIU 6:22-23
MATIU 6:22-23 IGBOB
Oriọna nke aru bu anya: ya mere ọ buru na anya-gi ele otù ebe, aru-gi dum gējuputa n'ìhè. Ma ọ buru na anya-gi jọrọ njọ, aru-gi dum gējuputa n'ọchichiri. Ya mere, ọ buru na ìhè nke di nime gi bu ọchichiri, le ka ọchichiri ahu si di oké ibù!


