Site na mb͕e ahu Jisus malitere ikwusa, na isi, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso. Ma mb͕e Ọ nējeghari n'usọ oké osimiri Galili, Ọ huru umu-nne abua, Saimon nke anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya, ka ha nāwuye ub͕u n'oké osimiri; n'ihi na ha bu ndi-ọkù. O we si ha, Bianu som n'azu, M'gēme unu ndi-ọkù nākuta madu. Ngwa ngwa ha we rapu ihe nile ha ji eb͕u azù, so Ya. O we si n'ebe ahu ga, hu umu-nne abua ọzọ, Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, nime ub͕ọ-ha, ha na nna-ha Zebedi, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù; O we kpọ ha. Ngwa ngwa ha we rapu ub͕ọ ahu na nna-ha, so Ya. Jisus we nējeghari na Galili dum, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche n'etiti ndi ahu. Akukọ Ya we jezue na Siria dum: ha we kutara Ya madu nile aru nādighi nma, ndi ọria di iche iche na nmekpa-aru di iche iche nējisi ike, ndi mọ ọjọ ji, ha na ndi ọnwa nēme ka anya ghara idi ha nma, na ndi akuku-aru-ha nwuru anwu; O we me ka aru di ha ike. Ọtutu ìgwè madu we si na Galili na Dekapọlis na Jerusalem na Judia na n'ofè Jọdan so Ya.
Gụọ MATIU 4
Geere nke a ntị MATIU 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 4:17-25
25 Days
Start a new Christmas tradition with a non-traditional twist on the season of Advent. An ideal start date for this adventure is December 1st, while an earlier start allows a more relaxed pace. Includes reflection questions and action steps to center each day on Christ. Great for individuals, families, or small groups.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị