Ma ndi jidere Jisus si n'ebe ahu duru Ya je rue ulo Kaiafas onye-isi-nchu-àjà, ebe ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye zukọrọ. Ma Pita soro Ya n'ebe di anya, rue obí onye-isi-nchu-àjà, o we ba nime, nọdu n'etiti ndi nēje ozi, ka ọ hu ọgwugwu-ya. Ma ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé dum nāchọ àmà ugha imegide Jisus, ka ha we me ka Ọ nwua; ma ha achọtaghi, ọ bu ezie na ọtutu ndi-àmà ugha biara. Ma emesia abua biara, si, Nwoke a siri, Apurum ikwatu ulo nsọ a nke Chineke, wu kwa ya n'ubọchi atọ. Onye-isi-nchu-àjà we bilie, si Ya, Ì zaghi ihe ọ bula? gini bu àmà madu ndia nāb͕agide Gi? Ma Jisus kpuchiri ọnu. Onye-isi-nchu-àjà we si Ya, Ewerem Chineke di ndu b͕a Gi iyí, ka I gwa ayi ma Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke.
Gụọ MATIU 26
Geere nke a ntị MATIU 26
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 26:57-63
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị