Ahuhu gādiri unu, ndi-ndú ìsì, ndi si, Onye ọ bula nke gēji ulo nsọ Chineke ṅu iyí, ọ bughi ihe; ma onye ọ bula nke gēji ọla-edo nke ulo nsọ ahu ṅu iyí, o ji ugwọ. Ndi-nzuzu na ndi-ìsì: n'ihi na òle nke dikariri uku, ọla-edo ahu, ma-ọbu ulo nsọ nke doro ọla-edo ahu nsọ? Unu si kwa, Onye ọ bula nke gēji ebe-ichu-àjà ṅu iyí, ọ bughi ihe; ma onye ọ bula nke gēji ihe-onyinye di n'elu ya ṅu iyí, o ji ugwọ. Ndi-ìsì: n'ihi na òle nke ka uku, ihe-onyinye, ma-ọbu ebe-ichu-àjà nke nēdo ihe-onyinye ahu nsọ? Ya mere, onye ji ebe-ichu-àjà ahu ṅu iyí, o ji ya, na ihe nile di n'elu ya, ṅu iyí. Onye ji kwa ulo nsọ ahu ṅu iyí, o ji ya, na Onye bi nime ya, ṅu iyí. Onye ji kwa elu-igwe ṅu iyí, o ji oche-eze Chineke, na Onye nọduru n'elu ya, ṅu iyí.
Gụọ MATIU 23
Geere nke a ntị MATIU 23
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 23:16-22
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị