Mb͕e ahu Jisus gwara ìgwè madu nile na ndi nēso uzọ-Ya okwu, si, N'oche Moses ka ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nọduru: ya mere, ihe nile, ka ha ra, bú nke ha gāsi unu me, menu ihe ndia, debe kwa ha: ma unu emela dika ọlu nile ha si di; n'ihi na ha nēkwu, ma ha adighi-eme. Ma ha nēke ibu di arọ́ di kwa ike obubu, tukwasi ha n'ubu madu; ma ha onwe-ha achọghi iji otù nkpisi-aka-ha wezuga ha. Ma ọlu-ha nile ka ha nālu ka madu we kiri ha: n'ihi na ha nēme ka phylactery nile ha di obosara, me kwa ka ọnu-ọnu uwe-ha di uku, ha nāhu kwa isi ọnọdu nile n'oriri nile unu n'anya, na isi oche nile n'ulo-nzukọ-unu, na ekele n'ọma-ahia nile unu, na ka madu nākpọ ha, Rabai.
Gụọ MATIU 23
Geere nke a ntị MATIU 23
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 23:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị