Ndi nēso uzọ-Ya we bia n'ofè ọzọ, chezọ kwa iji ob͕e achicha. Jisus we si ha, Nēlenu anya, nēze kwa ihe ndi-Farisi na ndi-Sadusi, bú ihe nēko achicha. Ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha, si, Ayi ejighi ob͕e achicha. Ma ebe Jisus mara ya Ọ si, Ndi okwukwe ntà, gini mere unu nēkwurita n'etiti onwe-unu, n'ihi na unu enweghi ob͕e achicha? Ùnu akātugharighi uche, ùnu echetaghi kwa ob͕e achicha ise nke nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri ahu, na nkata ole unu nara? Ùnu echetaghi kwa ob͕e achicha asa nke nnù ndikom iri ahu, na abọ ole unu nara? Ùnu si aṅa ghara itughari uche na agwaghm unu okwu bayere ob͕e achicha? Ma nēzenu ihe ndi-Farisi na ndi-Sadusi, bú ihe nēko achicha. Mb͕e ahu ka ha ghọtara na Ọ sighi ha nēze ihe nēko ob͕e achicha, kama ka ha nēze ozizí ndi-Farisi na ndi-Sadusi.
Gụọ MATIU 16
Geere nke a ntị MATIU 16
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 16:5-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị