MATIU 16:16-19
MATIU 16:16-19 IGBOB
Saimon Pita we za, si, Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke di ndu. Jisus we za, si ya, Ngọzi nādiri gi, Saimon Bā-Jona: n'ihi na anu-aru na ọbara ekpugheghi ya nye gi, kama ọ bu Nnam Nke bi n'elu-igwe. Ma Mu onwem si kwa gi, na gi onwe-gi bu Pita, ọ bu kwa n'elu oké nkume a ka M'gēwu nzukọm dika ulo; ọnu-uzọ nilenke Hedis agaghi-aka kwa ya n'ike. M'gēnye gi nkpisi-ugodi nke ala-eze elu-igwe: ihe ọ bula i gēke kwa ab͕u n'elu uwa, agēke ya n'elu-igwe: ihe ọ bula i gātọpu kwa ab͕u n'elu uwa, agātọpu ya n'elu-igwe.


