Ndi-Farisi na ndi-Sadusi we biakute Ya, jua Ya ka O gosi ha ihe-iriba-ama site n'elu-igwe, nānwa Ya. Ma Ọ zara, si ha, Mb͕e o ruru anyasi, unu nāsi, Iru elu-igwe gādi nma: n'ihi na elu-igwe nācha uhie uhie. N'ututu unu nāsi kwa, Iru elu-igwe gājọ njọ ta: n'ihi na elu-igwe nācha uhie uhie, b͕aru kwa. Unu mara itule iru elu-igwe, ma unu apughi itule ihe-iriba-ama nke oge ndia. Ajọ ọb͕ọ nke nākwa kwa iko nāchọ ihe-iriba-ama; ma agaghi-enye ya ihe-iriba-ama, ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona. O we rapu ha, pua.
Gụọ MATIU 16
Geere nke a ntị MATIU 16
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 16:1-4
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị