MATIU 14:28-31
MATIU 14:28-31 IGBOB
Pita we za Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na ọ bu Gi onwe-gi, sim biakute Gi n'elu miri. Ọ si, Bia. Pita we si n'ub͕ọ rida, je ije n'elu miri ahu, ijekuru Jisus. Ma mb͕e ọ huru ifufe, ọ tua egwu; ebe ọ malitere imìkpu, o ti kwa nkpu, si, Onye-nwe-ayi, zọputam. Ngwa ngwa Jisus setiri aka-Ya, jide ya, si ya, Onye okwukwe ntà, n'ìhi gini ka i ji nwe obi abua?

