Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru Ya ka Ọ nēje ije n'elu oké osimiri, obi we lọ ha miri, ha si, Ọ bu mọ; ha we tie nkpu site n'egwù. Ma ngwa ngwa Jisus gwara ha okwu, si, Nwenu obi-ike; ọ bu Mu: unu atula egwu. Pita we za Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na ọ bu Gi onwe-gi, sim biakute Gi n'elu miri. Ọ si, Bia. Pita we si n'ub͕ọ rida, je ije n'elu miri ahu, ijekuru Jisus. Ma mb͕e ọ huru ifufe, ọ tua egwu; ebe ọ malitere imìkpu, o ti kwa nkpu, si, Onye-nwe-ayi, zọputam. Ngwa ngwa Jisus setiri aka-Ya, jide ya, si ya, Onye okwukwe ntà, n'ìhi gini ka i ji nwe obi abua?
Gụọ MATIU 14
Geere nke a ntị MATIU 14
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 14:26-31
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị