Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 13:44-58

MATIU 13:44-58 IGBOB

Ala-eze elu-igwe yiri àkù ezoworo n'ubi; nke madu huru, zobe kwa; n'ọṅù-ya o we la, re ihe nile o nwere, ka ha ra, we zuta ubi ahu. Ọzọ kwa, ala-eze elu-igwe yiri onye-ahia nāchọ pearl ọma: ma mb͕e ọ huru otù pearl di oké ọnu-ahia, ọ je, re ihe nile o nwere, ka ha ra, we zuta ya. Ọzọ kwa, ala-eze elu-igwe yiri oké úb͕ú awuyere nime oké osimiri, nke kpokọta-kwa-ra ufọdu n'aha azù nile di iche iche: nke, mb͕e o juru, ha dọgotara ya n'ótú; ha we nọdu, chikọta azù di nma tiye nime ihe, ma ha tufuru nke nādighi nma. Otú a ka ọ gādi n'ọgwugwu oge a: ndi-mọ-ozi gāputa, kewaputa ndi bu ajọ madu n'etiti ndi ezi omume, ha gātubà kwa ha n'oké ọku ahu: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi. Ùnu aghọtawo ihe ndia nile? Ha si Ya, E. O we si ha, N'ihi nka ode-akwukwọ ọ bula nke emere ka ọ buru onye nēso uzọ ala-eze elu-igwe, o yiri madu nke bu nna-nwe-ulo, onye nēsi n'àkù-ya atuputa ihe ọhu na ihe ochie. O rue, mb͕e Jisus tubìri ilu ndia, O si n'ebe ahu zọlie. O we bia n'ala nke aka Ya, nēzí ha ihe n'ulo-nzukọ-ha, nke mere ka ibobo nwua ha n'aru, ha we si, Òle ebe ka Nwoke a nwere amam-ihe a na ọlu ndia di ike? Nwoke a, Ọ̀ bughi Nwa onye-ọ̀kà-ayi? àdighi-akpọ nne-Ya Meri? nà umu-nne-Ya ndikom, Jemes, na Josef, na Saimon, na Judas? Na umu-nne-Ya ndinyom, hà nile anọghi n'etiti ayi? Òle ebe kwa Nwoke a nwere ihe ndia nile? Ewe me ka ha ma n'ọnyà n'aru Ya. Ma Jisus siri ha, Onye-amuma abughi onye anādighi-asọpuru, ma-ọbughi n'ala nke aka ya, na n'ulo nke aka ya. Ọ lughi kwa ọtutu ọlu di ike n'ebe ahu n'ihi ekweghi-ekwe-ha.