Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 12:34-37

MATIU 12:34-37 IGBOB

Umu nke aju-ala, ùnu gēsi aṅa pu ikwu ezi ihe, ebe unu bu ajọ madu? n'ihi na ọnu site n'ihe nke obi nwebigara ókè nēkwu okwu. Ezi madu nēsi n'ezi àkù-ya atuputa ezi ihe: ajọ madu nēsi kwa n'ajọ àkù-ya atuputa ajọ ihe. Ma asim unu, na okwu ọ bula madu gēkwu nke nābaghi n'ihe, ha gāza ajuju bayere ya n'ubọchi ikpé. N'ihi na agēsite n'okwu-ọnu-gi nile gu gi n'onye ezi omume, agēsite kwa n'okwu-ọnu-gi nile kpeb͕u gi.