Ma mb͕e ndia nāla, Jisus malitere igwa ìgwè madu nile okwu bayere Jọn, si, Ọ̀ bu gini ka unu puru je n'ọhia ka unu kiri? àmì nke nēme nkpatu site n'ifufe? Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? ǹwoke eyikwasiworo uwe di biali-biali? Le, ndi nēyi uwe di biali-biali nọ n'ulo ndi-eze. Ma gini mere unu ji pua? ìhu onye-amuma? E, asim unu, onye kari kwa onye-amuma nke-uku. Nwoke a bu onye edeworo ihe n'akwukwọ nsọ bayere ya, si, Le, Mu onwem nēziga onye-ozim n'iru Gi, Onye gēmezi uzọ-Gi n'iru Gi. N'ezie asim unu, N'etiti ndi ndinyom muru ọ dighi onye biliworo nke ka Jọn Baptist uku: ma onye dikariri ntà n'ala-eze elu-igwe ka ya uku. Site n'ubọchi Jọn Baptist rue ub͕u a anēme kwa ala-eze elu-igwe ihe-ike, ndi nēme ihe-ike nāpunara ya. N'ihi na ndi-amuma nile na iwu Chineke buru amuma rue ubọchi Jọn. Ọ buru kwa na unu nāchọ inara ya nke-ọma, nwoke ahu bu Elaija, nke gaje ibia. Onye nwere nti inu ihe, ya nu.
Gụọ MATIU 11
Geere nke a ntị MATIU 11
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 11:7-15
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị