Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 1:1-25

MATIU 1:1-25 IGBOB

Akwukwọ osuso-ọmumu Jisus Kraist, Nwa Devid, nwa Abraham. Abraham muru Aisak; Aisak we mua Jekob; Jekob we mua Juda na umu-nna-ya; Juda we mua Perez na Zera site na Tema; Perez we mua Hezron; Hezron we mua Ram; Ram we mua Aminadab; Aminadab we mua Nahshon; Nahshon we mua Salmon; Salmon we mua Boaz site na Rehab; Boaz we mua Obed site na Rut; Obed we mua Jesi; Jesi we mua Devid, bú eze. Devid we mua Solomon site na nwunye nke Uraia; Solomon we mua Rehoboam; Rehoboam we mua Abaija; Abaija we mua Esa; Esa we mua Jehoshafat; Jehoshafat we mua Joram; Joram we mua Uzaia; Uzaia we mua Jotam; Jotam we mua Ehaz; Ehaz we mua Hezekaia; Hezekaia we mua Manase; Manase we mua Emon; Emon we mua Josaia; Josaia we mua Jekonaia na umu-nne-ya, na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon. Mb͕e emesiri ka ha je biri na Babilon, Jekonaia we mua Shealtiel; Shealtiel we mua Zerubabel; Zerubabel we mua Abaiud; Abaiud we mua Elaiakim; Elaiakim we mua Ezoa; Ezoa we mua Sedok; Sedok we mua Akim; Akim we mua Elaiud; Elaiud we mua Eleeza; Eleeza we mua Matan; Matan we mua Jekob; Jekob we mua Josef di Meri, nwanyi nke muru Jisus, Onye anākpọ Kraist. Ya mere ọb͕ọ nile site n'Abraham rue Devid di ọb͕ọ iri na anọ; site na Devid rue mb͕e emere ka ha je biri na Babilon di kwa ọb͕ọ iri na anọ; site na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon rue Kraist di kwa ọb͕ọ iri na anọ. Ma ọmumu Jisus Kraist di otú a: Mb͕e ekwereri na Josef gālu nne-Ya Meri, mb͕e ha akēdinakọtaghi, ahuru na ọ di ime site na Mọ Nsọ. Ma Josef di-ya, ebe ọ bu onye ezi omume, ma ọ chọghi igosi ya n'iru ọra, o zubere irapu ya na nzuzo. Ma mb͕e ihe ndia di ya n'obi, le, mọ-ozi nke Chineke were onwe-ya gosi ya na nrọ, si, Josef, nwa Devid, atula egwu ikuru nwunye-gi Meri: n'ihi na Ihe Nke ọ di ime Ya sitere n'aka Mọ Nsọ. Ọ gāmuputa kwa Nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-Ya Jisus, n'ihi na Ya onwe-ya gāzọputa ndi nke Ya na nmehie nile ha. Ma ihe a dum emewo, ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si, Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke, Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi. Josef we si n'ura-ya bilie, me dika mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi nyere ya iwu, we kuru nwunye-ya; ọ maghi kwa ya rue mb͕e ọ muputara Nwa-nwoke: o we kpọ aha-Ya Jisus.