LUK 7:44-47
LUK 7:44-47 IGBOB
Mb͕e O chigharisiri n'ebe nwanyi ahu nọ, Ọ si Saimon, Ì huru nwanyi a? Abataram n'ulo-gi, i nyeghi m miri iji sa ukwu: ma nwanyi a were anya-miri-ya desa ukwum, were kwa agiri-isi-ya hicha ha. I sutughm ọnu: ma nwanyi a, site na mb͕e M'batara, ọ rapughi isutu ukwum ọnu nke-uku. I weghi manu tem n'isi: ma nwanyi a were manu-otite tem n'ukwu. N'ihi nka asim i, Ab͕agharaworo ya nmehie-ya, nke di ọtutu; n'ihi na ọ hurum n'anya nke-uku: ma onye ab͕aghara ihe ntà, onye ahu nāhu n'anya nke-ntà.


