Ya onwe-ya we welie anya-Ya elu le ndi nēso uzọ-Ya, si, Ngọzi nādiri unu, bú ndi-ob͕eye: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke unu. Ngọzi nādiri unu ndi agu nāgu ub͕u a: n'ihi na afọ gēju unu. Ngọzi nādiri unu ndi nākwa ákwá ub͕u a: n'ihi na unu gāchì ọchì. Ngọzi nādiri unu, mb͕e ọ bula madu gākpọ unu asì, mb͕e ọ bula ha gēkewapu kwa unu, ta kwa unu uta, tufu kwa aha-unu dika ajọ ihe, n'ihi Nwa nke madu. Ṅurianu ọṅu n'ubọchi ahu, wuli-kwa-nu elu n'ihi ọṅù: n'ihi na le, ugwọ-ọ́lu-unu di uku n'elu-igwe: n'ihi na otú ahu ka ndi bu nna-ha mere ndi-amuma. Ma ahuhu gādiri unu ndi-ọgaranya: n'ihi na unu nēnwezu nkasi-obi-unu. Ahuhu gādiri unu, ndi afọ juworo ub͕u a: n'ihi na agu gāgu unu. Ahuhu gādiri unu, ndi nāchì ọchì ub͕u a: n'ihi na unu gēru újú kwa kwa ákwá. Ahuhu gādiri unu, mb͕e ọ bula madu nile gēkwu okwu ọma bayere unu: n'ihi na otú ahu ka ndi bu nna-ha mere ndi-amuma ugha.
Gụọ LUK 6
Geere nke a ntị LUK 6
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 6:20-26
7 Days
A blind beggar crying out desperately by the side of the road, an immoral woman despised as dirty by polite society, a corrupt government employee hated by all – how could any of these people from society’s fringes hope to connect with a holy God? Based on insights from the book of Luke in the Africa Study Bible, follow Jesus as he bridges the gap between God and the marginalized.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị