Ha we si Ya, Ndi nēso uzọ Jọn nēbu ọnu ọtutu mb͕e, nāriọ kwa aririọ; otú ahu ka ndi nēso uzọ ndi-Farisi nēme kwa; ma ndi nke Gi nēri nāṅu kwa. Ma Jisus siri ha, Ọ̀ gābu na unu puru ime ka umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu bue ọnu, mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ? Ma ubọchi gābia; mb͕e agānapu kwa ha Onye nālu nwunye ọhu, mb͕e ahu ka ha gēbu ọnu n'ubọchi ahu. O we tu-kwa-ra ha ilu, si, Ọ dighi onye ọ bula nādọkapu iberibe ákwà ọb͕ub͕a n'uwe ọhu tukwasi ya n'uwe ochie; eme otú a, ọ gādọka nke-ọhu, ọzọ kwa, iberibe ákwà ọb͕ub͕a si n'uwe ọhu ahu puta agaghi-adabà na nke-ochie. Ọ dighi kwa onye ọ bula nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie; eme otú a, manya-vine ọhu gāb͕awa karama-akpukpọ, manya onwe-ya gāwusì, karama-akpukpọ ahu gāla kwa n'iyì. Ma aghaghi ib͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu. Ọzọ kwa, ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ ṅuworo manya-vine ochie, nāchọ nke-ọhu: n'ihi na ọ si, Nke-ochie di nma.
Gụọ LUK 5
Geere nke a ntị LUK 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 5:33-39
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị