Ma le, ubọchi ahu ndikom abua nime ha nāga otù obodo ntà, aha-ya bu Emeus, nke di ọgu mail atọ site na Jerusalem. Ndi ahu nākparita kwa n'etiti onwe-ha uka bayere ihe ndia nile mereri. O we rue, mb͕e ha nākparita uka nājurita kwa onwe-ha ajuju, Jisus onwe-ya we biarue nso, so kwa ha ga. Ma eb͕ochiri ha anya ka ha ghara ima Ya. O we si ha, Gini bu okwu ndia unu nāgwarita onwe-unu, ka unu nāga ije? Ha we guzo nāb͕aru iru. Otù onye nime ha, aha-ya bu Kleopas, we za, si Ya, Ọ̀ bu nání Gi onwe-gi nọ dika ọbìa na Jerusalem nāmaghi ihe mere nime ya n'ubọchi ndia? Ọ si ha, Ihe gini? Ha si Ya, Ihe bayere Jisus Onye Nazaret, Onye bu onye-amuma di ike n'ọlu na okwu n'iru Chineke na ndi-Ju nile: ya na otú ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi-ayi rara Ya nye ka ama Ya ikpé ọnwu, we kpọgide Ya n'obe. Ma ayi onwe-ayi lere anya na Ya onwe-ya bu onye gaje ib͕aputa Israel. E, tukwasi kwa ihe ndia nile, ta bu ubọchi nke-atọ site na mb͕e ihe ndia mere. Ma ndinyom ufọdu n'etiti ayi mekwara ka ibobo nwua ayi n'aru, n'ihi na ha jere ílì-Ya n'isi-ututu; mb͕e ha nāhughi aru-Ya, ha we bia, si, na ha hukwarari ọhù, bú ndi-mọ-ozi, ndi siri na Ọ di ndu. Ufọdu n'etiti ndi soro ayi we je ílì ahu, hu kwa ya ọbuná otú ndinyom ahu kwuru: ma Ya onwe-ya ka ha nāhughi.
Gụọ LUK 24
Geere nke a ntị LUK 24
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 24:13-24
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị