Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 22:7-65

LUK 22:7-65 IGBOB

Ma ubọchi achicha ekoghi-eko biara, nke anāghaghi ichu àjà ngabiga. O we zipu Pita na Jọn, si, Ganu, doziere ayi oriri ngabiga, ka ayi we rie. Ha we si Ya, Òle ebe I nācho ka ayi dozie? Ọ si ha, Le, mb͕e unu batasiri nime obodo a, otù nwoke nke bū ite miri gēzute unu; sonu ya ba n'ulo nke ọ nābà nime ya. Unu gāsi kwa nna-nwe ulo ahu, Onye-ozizí si gi, Òle ebe ulo-ọbìa di, ebe Mu na ndi nēso uzọm gēri oriri ngabiga? Onye ahu gēgosi kwa unu ime-ulo uku di n'elu ulo akwadebeworo: dozienu n'ebe ahu. Ha we je, hu dika Ọ gwara ha-ri: ha we dozie ememe ngabiga. Mb͕e oge hour ahu ruru, O we nọdu na nri, Ya na ndi-ozi-Ya. O we si ha, Agu gusirim ike iso unu ri oriri ngabiga nka mb͕e Mu akāhughi ahuhu: n'ihi na asim unu, M'gaghi-eri ya ma-ọli, rue mb͕e ọ gēmezu n'ala-eze Chineke. O we nara iko, kele kwa, we si, Naranu nka, kè kwa ya n'etiti onwe-unu: n'ihi na asim unu, M'gaghi-aṅu ihe si n'osisi vine puta ma-ọli site ugbu a, rue mb͕e ala-eze Chineke gābia. O we nara ob͕e achicha, kele kwa, we nyawa ya, nye ha, si, Nka bu arum nke anēnye n'ihi unu: nēmenu nka ka anu we nēchetam. Mb͕e ha risiri nri-anyasi Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram, bú nke anāwusi n'ihi unu. Ma le, aka onye nāraram nye diyerem n'elu table. N'ihi na Nwa nke madu nāga n'ezie, dika akaworo ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Ya nye. Ha we malite ijurita onwe-ha, onye ọ bu n'etiti ha gēme ihe a. Esem-okwu we da kwa n'etiti ha, onye nime ha ka anāgu na ọ ka ibe-ya uku. O we si ha, Ndi-eze nke mba ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha; ndi nāchi kwa ha ka anākpọ ndi nālu ọlu ọma. Ma unu onwe-unu agaghi-adi otú a: kama onye ka ibe-ya uku n'etiti unu, ya di ka onye bu nwata; onye bu kwa onye-isi, ya di ka onye nēje ozi. N'ihi na ònye ka ibe-ya uku, onye nānọdu na nri, ma-ọbu onye nēje ozi? ọ̀ bughi onye nānọdu na nri? ma Mu onwem di n'etiti unu ka onye nēje ozi. Ma unu onwe-unu bu ndi soworom n'ọnwunwam nile; Mu onwem nāb͕a kwa ndu inye unu ala-eze, dika Nnam b͕ara ndu inyem, ka unu we rie ṅu kwa na table nkem n'ala-ezem; unu gānọkwasi kwa n'oche-eze nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé. Saimon, Saimon, le, Setan riọtara unu, ka ọ yọcha unu dika ọka: ma Mu onwem riọrọ aririọ bayere gi, ka okwukwe-gi ghara igwu agwu: gi-onwe-gi, mb͕e i gēchighariwori, gi me kwa ka umu-nna-gi guzosie ike. O we si Ya, Onye-nwe-ayi, abum onye edoziworo iso Gi ga rue ulo-nkpọrọ ru kwa ọnwu. O we si, Asim i, Pita, oke-ọkuku agaghi-akwá ta, rue mb͕e i gāgọ ub͕ò atọ, si na i mataghim. O we si ha, Mb͕e M'zipuru unu nējighi àkpà-ego, na àkpà-ije, na akpukpọ-ukwu, ọ̀ di ihe kọrọ unu? Ha si, Ọ dighi ihe kọrọ ayi. O we si ha, Ma ub͕u a, onye nwere àkpà-ego, ya were ya, onye nwere àkpà-ije, ya were kwa ya: ma onye nēnweghi, ya re uwe-ya, zuta mma-agha. N'ihi na asim unu, na ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ aghaghi imezu n'arum, Ọ bu kwa na ndi nēmebi iwu ka aguru Ya: n'ihi na ihe dirim nwere ọgwugwu. Ha we si, Onye-nwe-ayi, le, mma-agha abua di n'ebe a. O we si ha, O zuwo. O we puta, ga ugwu Olive, dika Ọ nēme mb͕e dum; ndi nēso uzọ-Ya soro kwa Ya. Ma mb͕e O ruru n'ebe ahu, Ọ siri ha, Nēkpenu ekpere ka unu ghara ibà n'ọnwunwa. Ewe weputa Ya onwe-ya n'etiti ha dika ebe agāturu nkume; O we b͕ue ikperè n'ala we nēkpe ekpere, si, Nna, ọ buru na ọ di Gi nma, naram iko a: otú ọ di, ka eme ihe Gi onwe-gi nāchọ, ọ bughi ihe Mu onwem nāchọ. Ewe me ka Ọ hu mọ-ozi nke si n'elu-igwe bia, nēnye Ya ike. Ma ebe o nēb͕u Ya nb͕u n'obi ri nne Ọ kpe ekpere si-ike karia: ọsusọ-Ya we ghọ ihe dika oké ọkpurukpu ọbara nāda n'ala. Mb͕e O biliri n'ekpere-Ya, O we biakute ndi nēso uzọ-Ya, Ọ hu ha ka ha nāraru ura site n'ihe-nwuta, O we si ha, Gini mere unu nāraru ura? bilienu nēkpe kwa ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa. Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, ìgwè madu biara; onye ahu anākpọ Judas, bú otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, buru kwa ha uzọ nābia; o we bia rue Jisus nso isutu Ya ọnu. Ma Jisus siri ya, Judas, ì ji isutu-ọnu nārara Nwa nke madu nye? Ma mb͕e ndi nọ Ya gburugburu huru ihe gādi, ha si, Onye-nwe-ayi, àyi gēwere mma-agha b͕ue? Otù onye nime ha we b͕ue orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti aka-nri ya. Ma Jisus zara, si, Kwenu ya rue nka. O we metu nti-ya aka, me ka aru di ya ike. Jisus we si ndi-isi-nchu-àjà, na ndi-ọchi-agha nke ulo uku Chineke, na ndi-okenye, ndi biara imegide Ya, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi, dika imegide onye nāpunara madu ihe? Mb͕e Mu na unu nọ kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke, unu esetighi aka-unu imegidem: ma nka bu oge hour unu, na ike nke ọchichiri. Ha we jide Ya, duru Ya je, dubà kwa Ya n'ulo onye-isi-nchu-àjà. Ma Pita nēso n'ebe di anya. Ma mb͕e ha funwuru ọku n'etiti obí, we nọdu ala n'otù, Pita we nọdu n'etiti ha. Ma otù nwa-ab͕ọghọ huru ya ka ọ nọduru n'ìhè ọku ahu, o we legide ya anya, si, Nwoke a na Ya nọ-kwa-ra. Ma ọ gọrọ, si, Nwanyi amataghim Ya. Mb͕e nwa oge gasiri onye ọzọ we hu ya, si, Gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ha. Ma Pita siri, Nwoke, abughim. Ma mb͕e ihe dika otù oge hour gasiri onye ọzọ kwusibere ike, si, N'ezie nwoke a na Ya nọkwara: n'ihi na ọ bu kwa onye Galili. Ma Pita siri, Nwoke, amataghim ihe i nēkwu. Ngwa ngwa, mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, oke-ọkuku we kwa ákwá. Onye-nwe-ayi we chigharia, le Pita anya. Pita we cheta okwu Onye-nwe-ayi, otú Ọ siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ta, i gāgọnarim ub͕ò atọ. O we pua, kwa ákwá nke-uku. Ndikom ndi jidere Jisus we me Ya ihe-ọchì, pia kwa Ya ihe. Ha we kechi iru-Ya, jua Ya, si, Bue amuma: ònye bu onye ahu nke tiri Gi aka? Ọtutu ihe ọzọ ka ha kwuru megide Ya, nēkwulu Ya.