O we malite ituru ndi-Ju ilu a: Otù onye kuru ubi-vini, were kwa ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ nọdu oge di anya. N'oge ighọ nkpuru o we zigara ndi-ọlu-ubi ahu otù orù, ka ha we nye ya nkpuru ufọdu nke ubi-vine ahu: ma ndi-ọlu-ubi ahu piara ya ihe, zilaga ya n'aka efu. O we zikwasi orù ọzọ: ha we pia kwa ya ihe, me ya ihe-ihere, zilaga ya n'aka efu. O we zikwasi orù nke-atọ: ha we meru kwa onye ahu aru, we tupu ya. Onye-nwe ubi-vine ahu we si, Gini ka m'gēme? m'gēziga ọkparam m'huru n'anya: eleghi anya ha gāsọpuru nwam nka. Ma mb͕e ndi-ọlu-ubi ahu huru ya, ha kwurita n'etiti onwe-ha, si, Nka bu onye-nketa: ka ayi b͕ue ya, ka ihe-nketa-ya we buru nke ayi. Ha we tupu ya n'azu ubi-vine ahu, b͕ue ya. Gini kwa ka onye-nwe ubi-vine ahu gēme ha? Ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n'iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ. Ma mb͕e ha nuru ya, ha si, Chineke ekwela. Ma O lere ha anya, si, Gini kwa bu ihe a nke edeworo n'akwukwọ nsọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo? Agētiwasi onye ọ bula nke dakwasiri nkume ahu; ma onye ọ bula ọ gādakwasi ya, ọ gēfesa ya ka uzuzu. Ndi-ode-akwukwọ na ndi-isi-nchu-àjà we chọ uzọ itukwasi Ya aka n'otù oge hour ahu; ma ha turu egwu ndi-Ju: n'ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha.
Gụọ LUK 20
Geere nke a ntị LUK 20
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 20:9-19
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị